This list is a continuation of our over 500 Igbo Praise And Worship Songs; to see other Lists Of Igbo Praise And Worship Songs, click on the Pages below:

Page… 1     2     3     4     5     6     7     8     9     10      Next

A – Lyrics

1. Aka Jehova n’eme mma – Lyrics
Aka Jihova!, Aka Jihova n’eme mma,
Oluebube Ya nke n’erughari n’ebe mno,
Isi iyi nke ndu nke nadighi Atata,
Aka Aka Ya, AKa Jehova n’eme mma.

2. Anyi ekele Gi Nna – Lyrics
Anyi ekele Gi Nna
Chineke,
anyi ekele Gi Nna
Imela

3. Agbaputawom n’ala apiti – Lyrics
Agbaputawom n’ala apiti
Omewom ka m guzo n’elu oke nkume
Otinyewom abu uto n’onum ta’
A-bu otitu Aleluyah.

4. Abum nke Jisos, otu obula osiri di – Lyrics
Abum nke Jisos, Abum nke Jisos,
Abum nke Ya, otu obula osiri di
Enwere m uto n’obi
Onu m buru ibu
Abum nke ya mgbenile

5. Agam asopuru Jihova mgbe nile – Lyrics
Agam asopuru Jihova mgbe nile
mgbe nile ka otito Ya ga adi m n’onu
Jihova ka mkpuru obi m ga eji nya isi
ndi nile di umeala n’obi gahu Ya nwe nwuria onu

6. Agam n’aga n’iru n’amara Jisos – Lyrics
Aga m n’aga n’ihu n’amara Jisos
Ihunanya ya di ukwu, aga m n’esogide Ya

List Of All Nigerian Praise And Worship Songs

7. Anam anuri na Jisos hurum n’anya – Lyrics
Anam anuri na Jisos hurum n’anya
Jisos hurum n’anya, Jisos hurum n’anya
Anam anuri onu.

8. Asacharam n’obara nke nwa aturu Nwe-nwe di ocha – Lyrics
Asacharam n’obara nke nwa aturu Nwe-nwe di ocha
Asacharam n’obara nke nwa aturu
M di ocha di oke onu ahia

9. A di m ka onye n’aro nro – Lyrics
A di m ka onye na aro nro, Onu ochi ejuwo m onu (3x)
N’ihi na Chineke emeworo m ihe ukwu

10. Anyi agaghi efe kwa ha ozo – Lyrics
Arusi nile nke juru n’elu uwa nka,
anyi agaghi efe kwa ha ozo,
arusi nile nke juru na mmiri
anyi agaghi efe kwa ha ozo,
nani Jisos ka m ga-efe, Onye kere uwa ka m ga-efe
ka m ga-efe (2x)

11. Aham, Aham, Aham di na ya – Lyrics
Aham, Aham, Aham di na ya
Aham, Aham, Aham di na ya
Aham, Aham, Aham di na ya
N’akwukwo nso Chineke
Aham di na ya

12. Agam ewere onwe m nye – Lyrics
Agam ewere onwem nye
Agam ewere onwem nye
Agam ewere onwem nye
N’aka Jihova agam ewre
Onwem nyecha ya kpam kpam kpam.

13. Aha Jehova di mma – Lyrics
Jehova, I dimma, Aha Jehova Dimma (2x)

14. Anyi abia wo, Anyi abia wo – Lyrics
Anyi abia wo, Anyi abia wo
N’iru gi, O…O Eze Jisos Anyi abia… wo

15. Agam ebulie Aha ya elu – Lyrics
Agam ebulie Aha ya elu (2x)
Chineke nna Onye kere uwa
Agam ebulie Aha ya elu

16. Amaram Ya Amaram Ya – Lyrics
Amaram Ya, Amaram Ya
Obu Ya bu Eze Jisos
Amaram ya

17. Adim njikere ime okwu gi – Lyrics
Adim njikere ime okwu gi
Adim njikere ime okwu gi
Adim njikere ime okwu nke Chineke
Adim njikere ime okwu gi

18. Anyi n’ala – Lyrics
Anyi n’ala, anyi n’ala o…
Eligwe e…… Igakwe soro
mgbe anyi ga ala n’Eligwe

19. Abum Onye obia nime Uwa – Lyrics
Abum Onye obia n’ime uwa
N’ime uwa
Abum onye obia, Eligwe bu ulo m.

20. Amaram n’uzo di warawara – Lyrics
Amaram n’uzo di warawara
Onu uzo Eligwe
Obosara onu uzo oku muo
Agaghim eso ya.

See other Igbo Praise And Worship Songs through the links: 1     2     3     4     5     6     7     8     9     10     Next

4 COMMENTS

Leave a Reply